Psalms 108

Abụ, Abụ Ọma Devid.

Ekpere nʼoge nsogbu

1Obi m dị njikere, o Chineke;
aga m eji mkpụrụobi m niile bụọ abụ ma kụkwaa egwu.
2Teta! Ụbọ akwara na une!
Aga m akpọte chi ọbụbọ.
3Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼetiti mba niile;
aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.
4Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu karịa eluigwe;
ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.
5Ka e bulie gị elu, o Chineke, karịa eluigwe niile,
ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.

6Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka,
ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
7Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị,
“Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,
tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ, nyepụ ya.
8Gilead bụ nke m, Manase bụkwa nke m;
Ifrem bụ okpu igwe m,
Juda bụ mkpara eze m.
9Moab bụ efere ịkwọ aka m,
aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm
nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”

10Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike?
Onye ga-edu m gaa Edọm?
11Ọ bụghị gị, o Chineke? Gị onye jụrụ anyị,
onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?
12Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro,
nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.
13Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri,
ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.
Copyright information for IboBIU